Izikiel 11

Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.

Ezekiel 11:9 (UKJV) And I will bring you out of the midst thereof, and deliver you into the hands of strangers, and will execute judgments among you.

7“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.

8Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

9Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.

10Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

11E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.