Izikiel 11

Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ezekiel 11:8 (UKJV) All of you have feared the sword; and I will bring a sword upon you, says the Lord GOD.

6Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.

7“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.

8Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

9Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.

10Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.