Izikiel 11

Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.

Ezekiel 11:6 (UKJV) All of you have multiplied your slain in this city, and all of you have filled the streets thereof with the slain.

4Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”

5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.

6Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.

7“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.

8Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.