8Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
9“Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
10“Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’
11Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
12“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.