Izikiel 12

Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 12:17 (UKJV) Moreover the word of the LORD came to me, saying,

15“Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.

16Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

17Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

18“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.

19Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.