14Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
15“Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.
16Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
17Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
18“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.