20Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”
21Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
22“Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
23Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu.
24Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.