24Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
25Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
26Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
27“Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
28“Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”