2“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
3“Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi.
4Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.
5Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
6Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”