Izikiel 13

Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,

Ezekiel 13:15 (UKJV) Thus will I accomplish my wrath upon the wall, and upon them that have daubed it with plaster, and will say unto you, The wall is no more, neither they that daubed it;

13“ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.

14Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

15Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,

16bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” ’

17“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.