Izikiel 13

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.

Ezekiel 13:3 (UKJV) Thus says the Lord GOD; Woe unto the foolish prophets, that follow their own spirit, and have seen nothing!

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.

3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.

4Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.

5Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.