2Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
3“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?
4Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị.
5Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’
6“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ.