13E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị.
14Aha gị dara ụda nke ukwuu nʼetiti mba dị iche iche nʼihi mma gị, nke zuruoke site nʼebube ahụ bụ nke m tụkwasịrị gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
15“ ‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya.
16Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.
17Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.