16Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.
17Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.
18Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye.
19Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara.
20“ ‘Ụmụ niile ị mụtaara m, nwoke na nwanyị, ka i ji chụọrọ arụsị gị aja ka ha rie. Ọ bụ na ịgba akwụna gị ezughịrị gị?