29I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.
30“ ‘Iwe m dị ọkụ megide gị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, ị na-eme ha nnọọ dị ka onye akwụna nke ihere adịghị eme.
31Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla.
32“ ‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!
33Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.