Izikiel 16

Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.

Ezekiel 16:33 (UKJV) They give gifts to all whores: but you give your gifts to all your lovers, and hire them, that they may come unto you on every side for your whoredom.

31Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla.

32“ ‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!

33Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.

34Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.

35“ ‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu Onyenwe anyị!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.