Izikiel 16

Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.

Ezekiel 16:34 (UKJV) And the contrary is in you from other women in your whoredoms, whereas none follows you to commit whoredoms: and in that you give a reward, and no reward is given unto you, therefore you are contrary.

32“ ‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!

33Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.

34Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.

35“ ‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu Onyenwe anyị!

36Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.