Izikiel 16

Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.

Ezekiel 16:39 (UKJV) And I will also give you into their hand, and they shall throw down yours eminent place, and shall break down your high places: they shall strip you also of your clothes, and shall take your fair jewels, and leave you naked and bare.

37nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile.

38Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.

39Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.

40Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.

41Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.