Izikiel 16

Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.

Ezekiel 16:41 (UKJV) And they shall burn yours houses with fire, and execute judgments upon you in the sight of many women: and I will cause you to cease from playing the harlot, and you also shall give no hire any more.

39Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.

40Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.

41Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.

42Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.

43“ ‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.