Izikiel 16

Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.

Ezekiel 16:42 (UKJV) So will I make my fury toward you to rest, and my jealousy shall depart from you, and I will be quiet, and will be no more angry.

40Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.

41Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.

42Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.

43“ ‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

44“ ‘Lee, onye ọbụla na-atụ ilu, ga-atụ ilu a banyere gị sị, “Otu ọ dị nne ka ọ dị nwa ya nwanyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.