43“ ‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
44“ ‘Lee, onye ọbụla na-atụ ilu, ga-atụ ilu a banyere gị sị, “Otu ọ dị nne ka ọ dị nwa ya nwanyị.”
45Nʼezie, ị dị ka nne gị, nʼihi na nne gị kpọrọ di ya na ụmụ ya asị. Ị dịkwa ka ụmụnne gị ndị inyom. Ha na-akpọ di ha na ụmụ ha asị. Nʼezie, nne gị bụ onye Het, nna gị bụkwa onye Amọrị.
46Ada nne gị bụ Sameria, ya na ụmụ ya bi nʼugwu. Nwanne gị nwanyị nke nta bụ Sọdọm, ya na ụmụ ya bi nʼala ndịda.
47Ọ bụghị naanị na ị soro ụzọ ha niile, ị ṅomiri omume ibi ndụ arụ ha niile, kama dịka a ga-asị na nke a bụ ihe nta, nʼụzọ gị niile, ị ghọrọ onye rụrụ arụ karịa ha.