Izikiel 16

Ebe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom emetụbeghị ihe ndị a gị na ụmụ gị ndị inyom mere.

Ezekiel 16:48 (UKJV) As I live, says the Lord GOD, Sodom your sister has not done, she nor her daughters, as you have done, you and your daughters.

46Ada nne gị bụ Sameria, ya na ụmụ ya bi nʼugwu. Nwanne gị nwanyị nke nta bụ Sọdọm, ya na ụmụ ya bi nʼala ndịda.

47Ọ bụghị naanị na ị soro ụzọ ha niile, ị ṅomiri omume ibi ndụ arụ ha niile, kama dịka a ga-asị na nke a bụ ihe nta, nʼụzọ gị niile, ị ghọrọ onye rụrụ arụ karịa ha.

48Ebe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom emetụbeghị ihe ndị a gị na ụmụ gị ndị inyom mere.

49“ ‘Mmehie nwanne gị nwanyị Sọdọm bụ nganga, na umengwụ, na oke oriri. Ha jụrụ inyere ndị nọ na mkpa, na ndị agụụ na-agụ nọ nʼọnụ ụzọ ha aka.

50Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.