50Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ.
51Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere.
52Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.
53“ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:
54Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.