60Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.
61Mgbe ahụ, ị ga-echeta ụzọ gị niile, ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnne gị ndị inyom ndị ahụ tọrọ gị na ndị nke ị tọrọ nye gị ha dịka ụmụ, ma ọ bụghị nʼihi ọgbụgba ndụ m.
62Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
63Mgbe ahụ, aga m ekpuchiri gị ajọ omume niile bụ nke ị mere. Ihere ga-eme gị mgbe i chetara ndụ ọjọọ gị, ị gaghị emeghekwa ọnụ gị kwuo okwu nʼihi oke mweda nʼala gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”