8A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
9“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.
10A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ”
11Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
12“Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.