Izikiel 17

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 17:11 (UKJV) Moreover the word of the LORD came unto me, saying,

9“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.

10A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ”

11Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

12“Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.

13O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.