14Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ.
15Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?
16“ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
17Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
18O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.