16“ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
17Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
18O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
19“ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
20Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.