18O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
19“ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
20Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.
21Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
22“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.