Izikiel 17

“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.

Ezekiel 17:22 (UKJV) Thus says the Lord GOD; I will also take of the highest branch of the high cedar, and will set it; I will crop off from the top of his young twigs a tender one, and will plant it upon an high mountain and eminent:

20Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.

21Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

22“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.

23Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.

24Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.