Izikiel 17

Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.

Ezekiel 17:3 (UKJV) And say, Thus says the Lord GOD; A great eagle with great wings, long pinions, full of feathers, which had divers colours, came unto Lebanon, and took the highest branch of the cedar:

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ.

3Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.

4Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.

5“ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.