5“ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
6Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.
7“ ‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri.
8A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
9“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.