Izikiel 18

ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a: “Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu, na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;

Ezekiel 18:11 (UKJV) And that does not any of those duties, but even has eaten upon the mountains, and defiled his neighbour's wife,

9Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,

11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a: “Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu, na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;

12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.

13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma. O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.