Izikiel 18

“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,

Ezekiel 18:10 (UKJV) If he brought forth a son that is a robber, a shedder of blood, and that does the like to any one of these things,

8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa, ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha. Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.

9Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,

11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a: “Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu, na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;

12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.