5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị, onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya, maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ, kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe, ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa, ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha. Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
9Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.