Izikiel 20

Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.

Ezekiel 20:19 (UKJV) I am the LORD your God; walk in my statutes, and keep my judgments, and do them;

17Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara.

18Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu.

19Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.

20Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.”

21“ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.