19Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.
20Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.”
21“ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.
22Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha
23E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa,