24nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha.
25Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ.
26E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’
27“Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m.
28Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ