Izikiel 20

Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’ ” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.)

Ezekiel 20:29 (UKJV) Then I said unto them, What is the high place unto which all of you go? And the name whereof is called Bamah unto this day.

27“Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m.

28Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ

29Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’ ” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.)

30“Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche?

31Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.