Izikiel 20

“Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’

Ezekiel 20:3 (UKJV) Son of man, speak unto the elders of Israel, and say unto them, Thus says the Lord GOD; Are all of you come to enquire of me? As I live, says the Lord GOD, I will not be enquired of by you.

1O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta Onyenwe anyị ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m.

2Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

3“Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’

4“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.

5Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.