Izikiel 21

Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.

Ezekiel 21:22 (UKJV) At his right hand was the divination for Jerusalem, to appoint captains, to open the mouth in the slaughter, to lift up the voice with shouting, to appoint battering rams against the gates, to cast a mount, and to build a fort.

20Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.

21Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.

22Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.

23Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.

24“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.