Izikiel 22

“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere.

Ezekiel 22:2 (UKJV) Now, you son of man, will you judge, will you judge the bloody city? yea, you shall show her all her abominations.

1Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị:

2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere.

3‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị.

4Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.