21Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya.
22Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ”
23Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
24“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’
25E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.