27Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha.
28Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla.
29Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi.
30“Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ.
31Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”