7A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa.
8I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile.
9Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị.
10Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
11Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.