15ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
16Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.
17Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi.
18Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.
19Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.