Izikiel 23

“Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.

Ezekiel 23:22 (UKJV) Therefore, O Aholibah, thus says the Lord GOD; Behold, I will raise up your lovers against you, from whom your mind is alienated, and I will bring them against you on every side;

20Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.

21Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.

22“Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.

23Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.

24Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.