35“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
36Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
37Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.
38Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
39Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.