Izikiel 24

Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.

Ezekiel 24:12 (UKJV) She has wearied herself with lies, and her great scum went not forth out of her: her scum shall be in the fire.

10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.

11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.

12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.

13“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.

14“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.