Izikiel 24

Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.

Ezekiel 24:10 (UKJV) Heap on wood, kindle the fire, consume the flesh, and spice it well, and let the bones be burned.

8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.

9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.

10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.

11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.

12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.